Nje ọrịa iku ume ndị na apụta, gụnyere COVID-19: ụzọ ndị esi achọpụta ya, mgbochi, nzaghachi na njikwa

Otu coronavirus bụ nnukwu ezinụlọ nke nje ama na ebute ọrịa bidoro na oyi nkịtị ruo na ọrịa ndị jọrọ oke njọ dị ka Middle East Respiratory Syndrome (MERS) na Severe Acute Respiratory Syndrome (SARS).

Achọpụtara coronavirus ọhụrụ (COVID-19) na 2019 na Wuhan, China. Achọpụtabubeghị coronavirus ọhụrụ a na mmadụ.

Ihe ọmụmụ a na ewete ozi maka COVID-19 yana nje ọrịa iku ume ndị na apụta, ezubere maka ndị ọkachamara ahụike ọhaneze, ndị njikwa ihe mberede yana ndị na arụ ọrụ na United Nations, ọgbakọ mba ofesi yana NGO.

N’ihi na emepụtara aha njirimara ọrịa ahụ ka emepụtachara ihe a, ebe ọ bụla akpọrọ nCoV na arụtụ aka na COVID-19, ọrịa ọfụfe ahụ nke coronavirus achọpụtara nso nso a butere.

Biko mara na a na-emegharị ọdịnaya nke nkuzi a ugbu a iji gosipụta ntụzịaka kacha ọhụrụ. Ị nwere ike ịchọta ozi emelitere na ụfọdụ isiokwu metụtara COVID-19 n'ime usoro ọmụmụ ndị a:

ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa: Ọwa ịgba ọgwụ mgbochi COVID-19

Usoro IPC: IPC maka COVID-19

Nnwale nyocha ngwa ngwa Antigen: 1) SARS-CoV-2 antigen fast diagnostic test; 2) Ihe ndị dị mkpa maka SARS-CoV-2 antigen RDT mmejuputa iwu

Biko mara: Emelitere ihe ndị a ikpeazụ na 16/12/2020.

Self-paced
Language: Asụsụ Igbo
COVID-19

Course information

Ọmụmụ a dịkwa adị n'asụsụ ndị a:

English - français - Español - 中文 - Português - العربية - русский - Türkçe - српски језик - فارسی - हिन्दी, हिंदी - македонски јазик - Tiếng Việt - Indian sign language - magyar - Bahasa Indonesia - বাংলা - اردو - Kiswahili - አማርኛ - ଓଡିଆ - Hausa - Tetun - Deutsch - Èdè Yorùbá - ਪੰਜਾਬੀ - isiZulu - Soomaaliga - Afraan Oromoo - دری - Kurdî - پښتو - मराठी - Fulfulde- සිංහල - Latviešu valoda - తెలుగు - Esperanto - ภาษาไทย - chiShona - Kreyòl ayisyen -Казақ тілі - தமிழ் - Ελληνικά

Nlebanye anya: Ihe ọmụmụ a na enye mmalite zuru oke maka nje ọrịa iku ume ndị na apụta, gụnyere coronavirus ọhụrụ. Na ngwụcha nke ihe ọmụmụ a, ị kwesịrị ịnwe ike ịkọwa:

  • Ụdịdị nke nje ọrịa iku ume ndị na apụta, otu esi achọpụta ma nyochaa ntiwapụ ọrịa, atụmatụ maka igbochi na ijikwa ntiwapụ ọrịa n’ihi nje ọrịa iku ume ọhụrụ ahụ;
  • Kedu atụmatụ ndị ekwesịrị iji wee kwukọrịta ihe egwu ma jikọta ndị obodo iji chọpụta, gbochie ma zaghachi nke mpụta nke nje ọrịa iku ume ọhụrụ ahụ.

Enwere ihe nju ndị agbakwunyere na modul ọ bụla iji nyere gị aka ghọtakwuo isiokwu a nke ọma.

Ebumnuche mmụta: Kọwaa ntọala ụkpụrụ nke nje ọrịa iku ume ndị na apụta yana otu a ga-esi zaghachi ntiwapụ ọrịa nke ọma.

Ogologo oge ihe ọmụmụ: Ihe dị ka aka elekere 3.

Asambodo: Asambodo Ndekọ nke Ntozu ga-adị maka ndị nsonye ndị nwere akara opekata mpe 80% nke mgbakọta akara dị n’ofe ajụ-aza ahụ niile. Ndị sonyere na -enweta Ndekọ nke Nweta nwekwara ike ibudata Badge Mepere emepe maka nkuzi a. Pịa ebe a ka ịmụta ka.

Atụgharịrị n’asụsụ Igbo site n’aka onye mwepụta onwe si na "Emerging respiratory viruses, including COVID-19: methods for detection, prevention, response and control", 2020. WHO anaghị anara ụta maka ọdịnaya ma ọ bụ ndaba nke ntụgharị asụsụ a. Na mmemme nke nnupu n’etiti Bekee yana ntụgharị asụsụ nke Igbo, ụdị nke Bekee nke izizi ga-abụ nke ga-anagide ma bụrụ ụdị nke ziri ezi.

WHO enyochaghị ntụgharị asụsụ a. Ezubere akụrụngwa a maka naanị ebumnuche nkwado mmụta.

Course contents

  • Modul 1: Mmalite nke nje ọrịa iku ume ndị na apụta, gụnyere COVID-19:

    Nchịkọta ebumnuche mmụta: Iji nwee ike ịkọwa ihe kpatara nje ọrịa iku ume na apụta, gụnyere COVID-19 bụ ihe egwu n’ahụike mmadụ na gburugburu ụwa
  • Modul 2: Ịchọpụta Nje ọrịa iku ume ndị na apụta, gụnyere COVID-19: Mkpachapụ anya na nyocha ụlọ ọrụ nyocha:

    Nchịkọta ebumnuche mmụta: Iji kọwaa otu esi achọpụta ma nyochaa ntiwapụ nje ọrịa iku ume na apụta
  • Modul 3: Nyocha Ụlọ Ọrụ Nyocha:

    Na ngwụcha nke ngalaba a, ndị nsonye ga- enwe ike ịkọwa: ụdị nke nlele achọrọ, ụdị nke nyocha ụlọ ọrụ nyocha eji achọpụta ọrịa.
  • Modul 4: Nkwukọrịta Ihe Egwu yana Njikọta Obodo:

    Nchịkọta ebumnuche mmụta: Iji kọwaa atụmatụ ndị ekwesịrị iji wee kwukọrịta ihe egwu ma jikọta ndị obodo iji chọpụta, gbochie ma zaghachi COVID-19
  • Modul 5: Njikọta Obodo:

    Na ngwụcha nke ngalaba a, ndị nsonye kwesịrị: kọwaa opekata mpe ihe atọ mere ndị nzaghachi kwesịrị isonye ndị obodo n’oge ntiwapụ ọrịa, Depụta ihe aka mgba ndị enwere na njikọta obodo (CE) ma, Kọwaa atụmatụ maka CE na arụ ọrụ na nchọpụta, mgbochi na ịzaghachi ntiwapụ ọria
  • Modul 6: Igbochi na Ịzaghachi nje ọrịa iku ume na apụta, gụnyere COVID-19:

    Nchịkọta ebumnuche mmụta: Iji kọwaa atụmatụ maka igbochi na ijikwa patojin iku ume ndị na apụta, gụnyere ntiwapụ ọrịa coronavirus.

Enroll me for this course

The course is free. Just register for an account on OpenWHO and take the course!
Enroll me now

Certificate Requirements

  • Gain a Record of Achievement by earning at least 80% of the maximum number of points from all graded assignments.