Otu coronavirus bụ nnukwu ezinụlọ nke nje ama na ebute ọrịa bidoro na oyi nkịtị ruo na ọrịa ndị jọrọ oke njọ dị ka Middle East Respiratory Syndrome (MERS) na Severe Acute Respiratory Syndrome (SARS).
Achọpụtara coronavirus ọhụrụ (COVID-19) na 2019 na Wuhan, China. Achọpụtabubeghị coronavirus ọhụrụ a na mmadụ.
Ihe ọmụmụ a na ewete ozi maka COVID-19 yana nje ọrịa iku ume ndị na apụta, ezubere maka ndị ọkachamara ahụike ọhaneze, ndị njikwa ihe mberede yana ndị na arụ ọrụ na United Nations, ọgbakọ mba ofesi yana NGO.
N’ihi na emepụtara aha njirimara ọrịa ahụ ka emepụtachara ihe a, ebe ọ bụla akpọrọ nCoV na arụtụ aka na COVID-19, ọrịa ọfụfe ahụ nke coronavirus achọpụtara nso nso a butere.
Ọmụmụ a dịkwa adị n'asụsụ ndị a:
English - français - Español - 中文 - Português - العربية - русский - Türkçe - српски језик - فارسی - हिन्दी, हिंदी - македонски јазик - Tiếng Việt - Indian sign language - magyar - Bahasa Indonesia - বাংলা - اردو - Kiswahili - አማርኛ - ଓଡିଆ - Hausa - Tetun - Deutsch - Èdè Yorùbá - ਪੰਜਾਬੀ - isiZulu - Soomaaliga - Afraan Oromoo - دری - Kurdî - پښتو - मराठी - Fulfulde- සිංහල - Latviešu valoda - తెలుగు -Esperanto- ภาษาไทย
Nlebanye anya: Ihe ọmụmụ a na enye mmalite zuru oke maka nje ọrịa iku ume ndị na apụta, gụnyere coronavirus ọhụrụ. Na ngwụcha nke ihe ọmụmụ a, ị kwesịrị ịnwe ike ịkọwa:
Enwere ihe nju ndị agbakwunyere na modul ọ bụla iji nyere gị aka ghọtakwuo isiokwu a nke ọma.
Ebumnuche mmụta: Kọwaa ntọala ụkpụrụ nke nje ọrịa iku ume ndị na apụta yana otu a ga-esi zaghachi ntiwapụ ọrịa nke ọma.
Ogologo oge ihe ọmụmụ: Ihe dị ka aka elekere 3.
Asambodo: Asambodo Ndekọ nke Ntozu ga-adị maka ndị nsonye ndị nwere akara opekata mpe 80% nke mgbakọta akara dị n’ofe ajụ-aza ahụ niile.
Atụgharịrị n’asụsụ Igbo site n’aka onye mwepụta onwe si na "Emerging respiratory viruses, including COVID-19: methods for detection, prevention, response and control", 2020. WHO anaghị anara ụta maka ọdịnaya ma ọ bụ ndaba nke ntụgharị asụsụ a. Na mmemme nke nnupu n’etiti Bekee yana ntụgharị asụsụ nke Igbo, ụdị nke Bekee nke izizi ga-abụ nke ga-anagide ma bụrụ ụdị nke ziri ezi.
WHO enyochaghị ntụgharị asụsụ a. Ezubere akụrụngwa a maka naanị ebumnuche nkwado mmụta.